18Maikaya gara nʼihu sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị: Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya.
19Ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab, eze Izrel, ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’ “Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ.
20Nʼikpeazụ, otu mmụọ pụtara guzo nʼihu Onyenwe anyị sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’ “Onyenwe anyị jụrụ ya sị, ‘Olee otu ị ga-esi mee nke a?’
21“Ọ zara, ‘Aga m apụ bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile.’ “Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’
22“Ma ugbu a, Onyenwe anyị etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. Onyenwe anyị ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.”