1Mgbe Jehoshafat, eze Juda, laghachiri nʼụlọ ya na Jerusalem nʼudo.
2Jehu nwa Hanani, onye ọhụ ọhụ, pụrụ gaa izute ya; ọ sịrị eze Jehoshafat, “O kwesiri ka i nyere onye ọjọọ aka? Ọ bụkwa ndị na-akpọ Onyenwe anyị asị ka ị na-ahụ nʼanya? Nʼihi nke a iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla gị.
3Ma otu ọ dị, achọtara ezi ihe nʼime gị, i sitela nʼala a wezuga ogidi Ashera niile, dozieekwa obi gị ịchọ Chineke.”