2 Ihe E Mere 19

Ugbu a, kwenụ ka egwu Onyenwe anyị dịrị nʼime unu. Kpeenụ ikpe ziri ezi, nʼihi na nʼebe Onyenwe anyị Chineke anyị nọ, ikpe ikpe na-ezighị ezi, maọbụ ile mmadụ anya nʼihu maọbụ iri ngarị adịghị ya.”

2 Chronicles 19:7 (UKJV) Wherefore now let the fear of the LORD be upon you; take heed and do it: for there is no iniquity with the LORD our God, nor respect of persons, nor taking of gifts.

5Ọ họpụtara ndị ikpe nʼala ahụ, nʼotu nʼotu nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nke Juda.

6Ọ gwara ha si, “Lezienụ anya ihe unu na-eme nʼihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Onyenwe anyị, onye na-anọnyere unu mgbe unu na-ekpebi ikpe.

7Ugbu a, kwenụ ka egwu Onyenwe anyị dịrị nʼime unu. Kpeenụ ikpe ziri ezi, nʼihi na nʼebe Onyenwe anyị Chineke anyị nọ, ikpe ikpe na-ezighị ezi, maọbụ ile mmadụ anya nʼihu maọbụ iri ngarị adịghị ya.”

8Ọzọkwa, nʼime Jerusalem, Jehoshafat họpụtara ụfọdụ ndị Livayị, na ndị nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ Izrel ka ha bụrụ ndị na-ahazi iwu nke Onyenwe anyị na-edozikwa esemokwu. Ha bikwa na Jerusalem.

9O nyere ha iwu ndị a, “Jirinụ ikwesi ntụkwasị obi, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rụọ ọrụ unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.