2 Ihe E Mere 20

Lee ihe ha ji akwụ anyị ụgwọ bụ ịchọ ka ha chụpụ anyị nʼala a i nyere anyị ka ọ bụrụ ihe nketa anyị.

2 Chronicles 20:11 (UKJV) Behold, I say, how they reward us, to come to cast us out of your possession, which you have given us to inherit.

9‘Ọ bụrụ na ihe ọjọọ adakwasị anyị, maọbụ mma agha, ma nke ikpe ọmụma, maọbụ ajọọ ọrịa na-efe efe, maọbụ oke ụnwụ, anyị ga-eguzo nʼihu gị nʼụlọnsọ a nke a kpọkwasịrị Aha gị, kpọkuo gị nʼime nsogbu anyị, gị onwe gị ga-aza anyị, zọpụtakwa anyị.’

10“Ugbu a lee, ndị ikom si Amọn, na Moab, na nʼugwu Sia, ndị ị na-ekweghị ka ndị Izrel banye nʼoke ala ha mgbe ha si nʼIjipt pụta, kama ha sitere nʼakụkụ ọzọ gabiga si otu a chebe ndị a ndụ.

11Lee ihe ha ji akwụ anyị ụgwọ bụ ịchọ ka ha chụpụ anyị nʼala a i nyere anyị ka ọ bụrụ ihe nketa anyị.

12O Chineke anyị, ọ bụ na ị gaghị ekpe ha ikpe? Nʼihi na ike adịghị nʼime anyị iguzogide igwe mmadụ ndị a bara ụba na-abịa ịlụso anyị ọgụ. Anyị amakwaghị ihe anyị ga-eme, kama ọ bụ na gị ka anya anyị na-adịkwasị.”

13Ndị ikom Juda niile, ha na ndị nwunye ha, na ụmụ ha, na ụmụntakịrị ha guzoro nʼihu Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.