2 Ihe E Mere 20

Echi pụọnụ izute ha. Ha ga arịgota site nʼụzọ warawara nrigo Ziz, unu ga-ahụ ha na nsọtụ ndagwurugwu dị tupu e ruo nʼọzara Jeruel.

2 Chronicles 20:16 (UKJV) Tomorrow go all of you down against them: behold, they come up by the cliff of Ziz; and all of you shall find them at the end of the brook, before the wilderness of Jeruel.

14Mgbe ahụ, mmụọ Nsọ Onyenwe anyị dakwasịrị Jahaziel nwa Zekaraya, nwa Benaya, nwa Jeiel, nwa Matanaya, bụ onye Livayị, onye si nʼikwu Asaf, dịka o guzo nʼetiti mkpọkọta ahụ.

15Ọ sịrị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda niile na ndị bi na Jerusalem, na gị eze Jehoshafat. Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-asị unu. ‘Unu atụla ụjọ, maọbụ daa mba, nʼihi usuu ndị agha a niile dị unu nʼihu. Ọ bụghị unu ka agha a dịịrị, kama ọ bụ Chineke nwe ya.

16Echi pụọnụ izute ha. Ha ga arịgota site nʼụzọ warawara nrigo Ziz, unu ga-ahụ ha na nsọtụ ndagwurugwu dị tupu e ruo nʼọzara Jeruel.

17Ọ bụghị unu ka ọ dịrị ịlụ agha a, kama werenụ ọnọdụ unu, guzosienụ ike ka unu jiri anya unu hụ nzọpụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-enye unu, unu ndị Juda na Jerusalem. Unu atụla egwu, unu adakwala mba. Pụkwuru ha nʼihu agha mgbe chi echi bọrọ, Onyenwe anyị ga-anọnyekwara unu.’ ”

18Mgbe ahụ, Jehoshafat, na ndị Juda na ndị Jerusalem niile dara nʼala kelee Onyenwe anyị, kpọọ isiala nye ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.