2 Ihe E Mere 20

O jere ije nʼụzọ niile nke Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.

2 Chronicles 20:32 (UKJV) And he walked in the way of Asa his father, and departed not from it, doing that which was right in the sight of the LORD.

30Ya mere, udo dịrị nʼalaeze Jehoshafat, nʼihi na Chineke nyere ya udo.

31Jehoshafat ghọrọ eze juda. Ọ gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze Juda. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi.

32O jere ije nʼụzọ niile nke Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.

33Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ ka nọ na-ejighị obi ha niile tụkwasị na Chineke nke nna nna ha.

34Ihe banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼọchịchị Jehoshafat, site na mbido ruo na ngwụcha, ka e dere nʼakwụkwọ ihe mere nke Jehu nwa Hanani, nke e debanyere nʼime akwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.