2 Ihe E Mere 20

Ha kwekọrịtara ka ha na ya wuo ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa. Emesịa, ha wuru ụgbọ ndị a nʼEziọn Geba.

2 Chronicles 20:36 (UKJV) And he joined himself with him to make ships to go to Tarshish: and they made the ships in Eziongaber.

34Ihe banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼọchịchị Jehoshafat, site na mbido ruo na ngwụcha, ka e dere nʼakwụkwọ ihe mere nke Jehu nwa Hanani, nke e debanyere nʼime akwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel.

35Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jehoshafat, bụ eze Juda jikọrọ onwe ha na Ahazaya, eze Izrel, onye ahụ omume ya jọrọ njọ.

36Ha kwekọrịtara ka ha na ya wuo ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa. Emesịa, ha wuru ụgbọ ndị a nʼEziọn Geba.

37Elieza nwa Dodavahu, onye Maresha buru amụma megide Jehoshafat, na-asị, “Nʼihi na i kwenyere ka gị na Ahazaya na-azụkọ ahịa, Onyenwe anyị ga-emebi ihe ndị a ị rụrụ.” Ụgbọ mmiri ahụ niile kpuru, ha enwekwaghị ike ijeru Tashish zụọ ahịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.