2 Ihe E Mere 21

Jehoram natara akwụkwọ ozi site nʼaka Ịlaịja onye amụma, nke sịrị: “Otu a ka Onyenwe anyị Chineke nke nna gị Devid, kwuru, ‘Nʼihi na i soghị ụzọ niile nke nna gị, bụ Jehoshafat, maọbụ nke Asa bụ eze Juda,

2 Chronicles 21:12 (UKJV) And there came a writing to him from Elijah the prophet, saying, Thus says the LORD God of David your father, Because you have not walked in the ways of Jehoshaphat your father, nor in the ways of Asa king of Judah,

10Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa. Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ, nʼihi na Jehoram gbakụtara Onyenwe anyị Chineke nna nna ya ha azụ.

11O wukwara ọtụtụ ebe dị elu nʼọtụtụ ugwu nke Juda, mee ka ndị bi na Jerusalem were onwe ha nye ife arụsị. O si otu a duhiekwa Juda.

12Jehoram natara akwụkwọ ozi site nʼaka Ịlaịja onye amụma, nke sịrị: “Otu a ka Onyenwe anyị Chineke nke nna gị Devid, kwuru, ‘Nʼihi na i soghị ụzọ niile nke nna gị, bụ Jehoshafat, maọbụ nke Asa bụ eze Juda,

13kama ị sooro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, meekwa ka ndị Juda na ndị Jerusalem fee chi ọzọ, dịka ụlọ Ehab mere. Ị gbuola ụmụnne nke gị, ndị bụ ndị si nʼezinaụlọ nke gị onwe gị, ndị ikom bụ ndị dị mma karịa gị.

14Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị ga-eji ihe otiti nke ọrịa tie ndị gị, ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye gị, na ihe niile i nwere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.