2 Ihe E Mere 23

Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, na ndị a na-asọpụrụ, na ndị na-achị achị, na ndị ala ahụ niile, dupụta eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha bara nʼụlọeze site nʼọnụ ụzọ ama nke dị Elu, mee ka eze nọkwasị nʼelu ocheeze.

2 Chronicles 23:20 (UKJV) And he took the captains of hundreds, and the nobles, and the governors of the people, and all the people of the land, and brought down the king from the house of the LORD: and they came through the high gate into the king's house, and set the king upon the throne of the kingdom.

18Mgbe ahụ, Jehoiada nyefere nlekọta nke ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị nʼaka ndị nchụaja bụ ndị Livayị, bụ ndị Devid nyere ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ nke Onyenwe anyị nʼime ụlọnsọ, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, nʼiji ọṅụ na ịbụ abụ dịka Devid nyere nʼiwu.

19O debekwara ndị nche nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, igbochi ka onye ọbụla nke na-adịghị ọcha nʼụzọ ọbụla ghara ịbanye.

20Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, na ndị a na-asọpụrụ, na ndị na-achị achị, na ndị ala ahụ niile, dupụta eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha bara nʼụlọeze site nʼọnụ ụzọ ama nke dị Elu, mee ka eze nọkwasị nʼelu ocheeze.

21Ndị ala ahụ niile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, obodo ahụ dakwara jụụ, nʼihi na e ji mma agha gbuo Atalaya nʼụlọeze.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.