2 Ihe E Mere 24

Ma Jehoiada mere nnọọ agadi, jupụtakwa nʼọtụtụ afọ, ọ nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri afọ atọ.

2 Chronicles 24:15 (UKJV) But Jehoiada waxed old, and was full of days when he died; an hundred and thirty years old was he when he died.

13Ndị e nyefere ọrụ ahụ nʼaka ji obi ha niile rụọ ọrụ nke mere na ọrụ ahụ gara nʼihu nke ọma. Ha rụziri ụlọnsọ ukwu Chineke dịka atụmatụ ya mbụ si dị, meekwa ya ka o sie ike karịa.

14Mgbe ha rụsịrị ọrụ niile, ha weghachitere ego fọdụrụ, nye ya eze na Jehoiada, ha were ya rụta ngwa ije ozi maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, ngwa ije ozi na ihe isure aja nsure ọkụ, na ngaji, ya na efere dị iche iche, na ihe ọlaọcha na ọlaedo. A na-achụ aja nsure ọkụ nʼụlọnsọ nye Onyenwe anyị ụbọchị niile Jehoiada dị ndụ.

15Ma Jehoiada mere nnọọ agadi, jupụtakwa nʼọtụtụ afọ, ọ nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri afọ atọ.

16E liri ya nʼebe a na-eli ndị eze nʼobodo Devid nʼihi ihe ọma niile o meere Izrel na Chineke na ụlọnsọ ya.

17Mgbe Jehoiada nwụsịrị, ndịisi Juda bịara ịkwanyere eze Joash ugwu. O gekwara ha ntị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.