11Ụmụ m, o kwesighị ka unu gbakụta ọrụ unu azụ ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara unu iguzo nʼihu ya, na ijere ya ozi, na ịrụ ọrụ nʼihu ya, na ịchụrụ ya aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.”
12Nʼoge a ndị Livayị ndị a malitere ọrụ: site nʼikwu Kohat: Mahat na Amasai, na Juel nwa Azaraya; nʼikwu Merari: Kish nwa Abdi, na Azaraya nwa Jehalelel; nʼikwu Geshọn: Joa nwa Zima, na Eden nwa Joa;
13nʼikwu Elizafan: Shimri, na Jeiel; nʼikwu Asaf: Zekaraya, na Matanaya;
14nʼikwu Heman: Jehiel, na Shimei; nʼikwu Jedutun: Shemaya, na Uziel.
15Mgbe ha kpọkọtara ụmụnna ha bụ ndị Livayị, dokwaa onwe ha ọcha, ha bara ido ụlọnsọ Onyenwe anyị nsọ, dịka eze nyere nʼiwu, nʼusoro okwu Onyenwe anyị si dị.