13nʼikwu Elizafan: Shimri, na Jeiel; nʼikwu Asaf: Zekaraya, na Matanaya;
14nʼikwu Heman: Jehiel, na Shimei; nʼikwu Jedutun: Shemaya, na Uziel.
15Mgbe ha kpọkọtara ụmụnna ha bụ ndị Livayị, dokwaa onwe ha ọcha, ha bara ido ụlọnsọ Onyenwe anyị nsọ, dịka eze nyere nʼiwu, nʼusoro okwu Onyenwe anyị si dị.
16Ndị nchụaja banyere nʼime ebe nsọ ahụ ido ya nsọ. Ihe niile na-adịghị ọcha ha hụrụ nʼime ya ka ha wepụtasịrị nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ndị Livayị buuru ha gaa bufuo na Ndagwurugwu Kidrọn.
17Ha bidoro mmemme ido nsọ a nʼabalị mbụ nʼọnwa nke mbụ. Nʼabalị nke asatọ ha ruru na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma o were ha abalị asatọ ọzọ idochasị ụlọnsọ ahụ nsọ maka ofufe, ha jezuru ozi niile nʼabalị iri na isii nke ọnwa mbụ ahụ.