2 Ihe E Mere 29

Nʼụtụtụ echi ya, eze bụ Hezekaya kpọkọtara ndịisi obodo niile, gaa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ.

2 Chronicles 29:20 (UKJV) Then Hezekiah the king rose early, and gathered the rulers of the city, and went up to the house of the LORD.

18Mgbe ahụ, ha bakwuru eze bụ Hezekaya kọọrọ ya sị, “Anyị emeela ebe niile nʼụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ dị nsọ, ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na ngwongwo ya, na tebul ịdọba achịcha e doro nsọ, na ihe niile dị nʼime ya.

19Ọzọ, anyị edoziela ma dokwaa ngwongwo ahụ niile nsọ, bụ nke eze Ehaz wepụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya mgbe ọ bụ eze. Ha dịkwa ugbu a nʼihu ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị.”

20Nʼụtụtụ echi ya, eze bụ Hezekaya kpọkọtara ndịisi obodo niile, gaa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ.

21Ha wetara oke ehi asaa, na ebule asaa, na ụmụ ebule asaa, na mkpi asaa, maka ịchụ aja mmehie nʼihi alaeze ahụ, maka ụlọnsọ ukwu ahụ, na ala Juda. Eze nyere ndị nchụaja bụ ụmụ Erọn iwu sị ha gbuo anụ ụlọ ndị ahụ nʼebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị.

22Ya mere, ha gburu oke ehi ahụ niile. Ndị nchụaja fesara ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja. Ha gbukwara ebule ndị ahụ fesa ọbara ha nʼebe ịchụ aja, gbukwaa ụmụ atụrụ ndị ahụ fesakwa ọbara ha nʼebe ịchụ aja.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.