2 Ihe E Mere 29

Ọzọ, anyị edoziela ma dokwaa ngwongwo ahụ niile nsọ, bụ nke eze Ehaz wepụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya mgbe ọ bụ eze. Ha dịkwa ugbu a nʼihu ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị.”

2 Chronicles 29:19 (UKJV) Moreover all the vessels, which king Ahaz in his reign did cast away in his transgression, have we prepared and sanctified, and, behold, they are before the altar of the LORD.

17Ha bidoro mmemme ido nsọ a nʼabalị mbụ nʼọnwa nke mbụ. Nʼabalị nke asatọ ha ruru na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma o were ha abalị asatọ ọzọ idochasị ụlọnsọ ahụ nsọ maka ofufe, ha jezuru ozi niile nʼabalị iri na isii nke ọnwa mbụ ahụ.

18Mgbe ahụ, ha bakwuru eze bụ Hezekaya kọọrọ ya sị, “Anyị emeela ebe niile nʼụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ dị nsọ, ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na ngwongwo ya, na tebul ịdọba achịcha e doro nsọ, na ihe niile dị nʼime ya.

19Ọzọ, anyị edoziela ma dokwaa ngwongwo ahụ niile nsọ, bụ nke eze Ehaz wepụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya mgbe ọ bụ eze. Ha dịkwa ugbu a nʼihu ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị.”

20Nʼụtụtụ echi ya, eze bụ Hezekaya kpọkọtara ndịisi obodo niile, gaa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ.

21Ha wetara oke ehi asaa, na ebule asaa, na ụmụ ebule asaa, na mkpi asaa, maka ịchụ aja mmehie nʼihi alaeze ahụ, maka ụlọnsọ ukwu ahụ, na ala Juda. Eze nyere ndị nchụaja bụ ụmụ Erọn iwu sị ha gbuo anụ ụlọ ndị ahụ nʼebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.