9Ịdị arọ ọlaedo e ji kpụọ ǹtu e ji wuo ya dị iri shekel ise. E jikwa ọlaedo techie akụkụ elu elu nke ime ọnụ ụlọ a.
10Solomọn tinyere oyiyi mmụọ ozi cherubim abụọ ọ kpụrụ nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, werekwa ọlaedo machie ha.
11Ịdị ogologo nku cherubim ndị a ruru mita iri. Ịdị ogologo otu nku cherub nke mbụ ruru mita abụọ na ọkara. Ọnụ nku a na-emetụ ahụ ime ụlọ nke ụlọnsọ ukwu, ma ọnụ ọnụ nku nke ọzọ, nke ịdị ogologo ya ruru mita abụọ nʼọkara, na-emetụ ọnụ otu nku cherub nke ọzọ.
12Nʼotu aka ahụ, otu nku cherub nke abụọ ruru mita abụọ na ọkara nʼogologo. Ọnụ nku ya na-emetụ akụkụ nke ọzọ nke ahụ ime ụlọnsọ ukwu, ma nku ya nke ọzọ, nke rukwara mita abụọ na ọkara nʼogologo, na-emetụ ọnụ ọnụ otu nku cherub nke mbụ.
13Nku cherubim ndị a gbasapụrụ ruo mita iri nʼogologo. Ha guzo ọtọ nʼụkwụ ha, na-eche ihu nʼọnụ ụlọ ezumezu ahụ.