2 Ihe E Mere 3

Ịdị arọ ọlaedo e ji kpụọ ǹtu e ji wuo ya dị iri shekel ise. E jikwa ọlaedo techie akụkụ elu elu nke ime ọnụ ụlọ a.

2 Chronicles 3:9 (UKJV) And the weight of the nails was fifty shekels of gold. And he overlaid the upper chambers with gold.

7Ogidi osisi silin niile, na ibo ọnụ ụzọ niile, na aja ụlọ niile, na ọnụ ụzọ niile dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ ka o ji ọlaedo techie. Ọ gbukwara egbugbu oyiyi cherubim na mgbidi ya niile.

8O wuru Ebe ahụ Kachasị Nsọ; nke ogologo ọnụ ụlọ ya dị mita iri, otu a kwa, obosara ya dị mita iri. O ji ọlaedo dị ezi mma nke ọnụahịa ya ruru narị talenti isii techie ahụ ime ụlọ ahụ niile.

9Ịdị arọ ọlaedo e ji kpụọ ǹtu e ji wuo ya dị iri shekel ise. E jikwa ọlaedo techie akụkụ elu elu nke ime ọnụ ụlọ a.

10Solomọn tinyere oyiyi mmụọ ozi cherubim abụọ ọ kpụrụ nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, werekwa ọlaedo machie ha.

11Ịdị ogologo nku cherubim ndị a ruru mita iri. Ịdị ogologo otu nku cherub nke mbụ ruru mita abụọ na ọkara. Ọnụ nku a na-emetụ ahụ ime ụlọ nke ụlọnsọ ukwu, ma ọnụ ọnụ nku nke ọzọ, nke ịdị ogologo ya ruru mita abụọ nʼọkara, na-emetụ ọnụ otu nku cherub nke ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.