2 Ihe E Mere 3

Ogidi osisi silin niile, na ibo ọnụ ụzọ niile, na aja ụlọ niile, na ọnụ ụzọ niile dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ ka o ji ọlaedo techie. Ọ gbukwara egbugbu oyiyi cherubim na mgbidi ya niile.

2 Chronicles 3:7 (UKJV) He overlaid also the house, the beams, the posts, and the walls thereof, and the doors thereof, with gold; and graved cherubims on the walls.

5O ji osisi junipa machie ahụ ime ụlọ ezumezu ahụ, jirikwa ọlaedo a nụchara anụcha techie osisi ndị ahụ niile. Emesịa, e sere oyiyi nkwụ dị iche iche, na oyiyi ụdọ igwe nʼahụ ụlọ ahụ iji chọọ ya mma.

6O ji nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche chọọ ime ụlọnsọ ahụ mma, ya na ọlaedo nke e si na Pavaim bute.

7Ogidi osisi silin niile, na ibo ọnụ ụzọ niile, na aja ụlọ niile, na ọnụ ụzọ niile dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ ka o ji ọlaedo techie. Ọ gbukwara egbugbu oyiyi cherubim na mgbidi ya niile.

8O wuru Ebe ahụ Kachasị Nsọ; nke ogologo ọnụ ụlọ ya dị mita iri, otu a kwa, obosara ya dị mita iri. O ji ọlaedo dị ezi mma nke ọnụahịa ya ruru narị talenti isii techie ahụ ime ụlọ ahụ niile.

9Ịdị arọ ọlaedo e ji kpụọ ǹtu e ji wuo ya dị iri shekel ise. E jikwa ọlaedo techie akụkụ elu elu nke ime ọnụ ụlọ a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.