14O ji akwa na-acha anụnụ anụnụ, na uhie uhie, na odo odo, na ezi akwa ọcha, mee akwa mgbochi, nke a kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
15O wuru ogidi abụọ dị nʼihu ụlọnsọ ahụ, nke ịdị elu ya ruru mita iri na asaa. Ọ kpụkwara ihe a dokwasịrị nʼelu ogidi ndị a, nke ịdị elu ha dị mita abụọ na ọkara.
16Ọ kpụkwara ihe yiri ụdọ igwe a tụrụ atụ, nke e kokwasịrị nʼelu ogidi abụọ ndị ahụ. Kpụọkwa narị mkpụrụ pomegranet, nke a ganyekọtara ya na ụdọ igwe ahụ.
17O guzobere ogidi abụọ ndị ahụ nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ, otu nʼakụkụ ugwu nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Ogidi nke dị na ndịda ka ọ kpọrọ Jakin, ma nke dị nʼugwu ka ọ kpọrọ Boaz.