21Ya mere, ndị Izrel ahụ niile ji ọṅụ mee mmemme achịcha ekoghị eko ahụ na Jerusalem ụbọchị asaa. Ma ndị nchụaja na ndị Livayị ji abụ na ngwa egwu Onyenwe anyị too ya otuto ụbọchị ahụ niile.
22Hezekaya ji okwu dị mma gbaa ndị Livayị ume nʼihi ezi nghọta ha nwere nʼijere Onyenwe anyị ozi. Nʼime ụbọchị asaa ahụ niile, ha chụrụ aja udo, riekwa ihe ha ketara site nʼaja niile a chụrụ. Ha tokwara Onyenwe anyị Chineke nna nna ha otuto.
23Nʼihi oke ọṅụ ha niile nwere, ha kpebiri ime mmemme ahụ gaa nʼihu ụbọchị asaa ọzọ.
24Hezekaya eze Juda, nyere nzukọ ahụ otu puku oke ehi, na puku atụrụ asaa. Ndị ozi eze niile nyekwara ha, otu puku oke ehi na puku atụrụ iri. Ọtụtụ ndị nchụaja dooro onwe ha nsọ.
25Nʼoge ahụ kwa, oke ọṅụ jupụtara nʼobi ndị Juda niile, na nʼobi ndị nchụaja na ndị Livayị, na nʼobi ndị ọbịa, na ndị sitere ala Izrel bịa.