11Hezekaya nyere iwu ka e edozie ụlọ ịchịkọba ihe nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ha mekwara otu a.
12Emesịa, ha jiri ikwesi ntụkwasị obi bubata onyinye ndị ahụ, na onyinye nke otu ụzọ nʼime ụzọ iri, na onyinye e doro nsọ, tifee ha nʼaka Konanaya, onye Livayị. Shimei nwanne ya nwoke bụ onye na-esote ya.
13Jehiel, Azazaya, Nahat, Asahel, Jerimot, Jozabad, Eliel, Ismakaya, Mahat na Benaya, bụ ndị nlekọta ọrụ ndị nọ nʼokpuru Konanaya na Shimei nwanne ya. Ndị a niile bụ ndị eze Hezekaya na Azaraya onye nlekọta ụlọnsọ ukwu Chineke họpụtara.
14Kore nwa Imna, onye Livayị, onye bụkwa onye na-elekọta ọnụ ụzọ ama dị nʼọwụwa anyanwụ, ka e tinyere ọrụ ilekọta onyinye afọ ofufu niile e wetaara Chineke. Ọ bụ ya nwekwa ọrụ ikesa onyinye ndị ahụ niile e bubataara Onyenwe anyị ha na onyinye ndị ọzọ e doro nsọ.
15Ndị na-enyere ya aka bụ Eden, Miniamin, Jeshua, Shemaya, Amaraya na Shekanaya. Ha na-eke onyinye ahụ nye ndị nchụaja niile nʼobodo ahụ, onye ukwu na onye nta, dịka usoro ịrụ ọrụ ha si dị. Ha ji ikwesi ntụkwasị obi na-enyere ya aka.