15Ndị na-enyere ya aka bụ Eden, Miniamin, Jeshua, Shemaya, Amaraya na Shekanaya. Ha na-eke onyinye ahụ nye ndị nchụaja niile nʼobodo ahụ, onye ukwu na onye nta, dịka usoro ịrụ ọrụ ha si dị. Ha ji ikwesi ntụkwasị obi na-enyere ya aka.
16Ọzọkwa, ndị ikom niile si nʼezinaụlọ ndị nchụaja, ndị gbara site nʼafọ atọ gbagoo, ndị aha ha dị nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na-eketa oke ihe oriri ha na-eri mgbe ọbụla ha bịara ịrụ ọrụ dịka usoro ọrụ ha si dị.
17Ha na-ekenye ndị nchụaja niile e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, kenyekwa ndị Livayị niile gbara site iri afọ abụọ gbagoo ihe oriri dịka usoro ọrụ ha si dị.
18Ndị na-esokwa keta oke ndị a bụ ụmụntakịrị, na ndị inyom, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom na-etolite etolite, bụ ndị niile e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ndị a bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼido onwe ha nsọ.
19A họpụtara ụfọdụ ndị ikom ndị ọrụ ha bụ ike nri nye ndị nchụaja niile bụ ụmụ ụmụ Erọn. Ndị nchụaja a na-ekwu ihe banyere ha nʼebe a bụ ndị ahụ bi nʼala ubi nke gbara obodo ndị nchụaja gburugburu, maọbụ ndị bi nʼobodo ndị ọzọ. Ndị a bụkwa ndị e dere aha ha niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ndị Livayị.