24Ma nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa, ruo na ọ gaara anwụ. Ma o kpere ekpere rịọ Onyenwe anyị ka ọ gwọọ ya. Ọ zara ekpere ya, gosikwa ya ihe ịrịbama dị ebube.
25Ma Hezekaya ejighị obi ya niile kelee Chineke ekele nʼihi na nganga batara ya nʼobi. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị megide ya na ndị Jerusalem na Juda.
26Mgbe Hezekaya na ndị Jerusalem wedara onwe ha nʼala, iwe Onyenwe anyị dajụrụ nʼebe ha nọ, ọ takwaghị ha ahụhụ nʼoge niile ahụ Hezekaya dị ndụ.
27Ya mere, Hezekaya ghọrọ eze bara ọgaranya, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. O wuru ụlọakụ maka ichebe ọlaọcha ya na ọlaedo, na nkume dị oke ọnụahịa, na ụda na-esi isi ụtọ, na ọta na efere ọlaedo ya.
28O wukwara ọtụtụ ụlọ ọzọ ebe a na-echebe ọka, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv. O wukwara ụlọ anụmanụ maka ọtụtụ igwe ewu na atụrụ ya.