31Ma mgbe ndị ozi nke ndị na-achị Babilọn zitere ka ha jụọ ya banyere ihe ebube ahụ nke mere nʼala ahụ, Chineke hapụrụ ya i nwalee ya, ka ọ mara ihe niile dị ya nʼobi.
32Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, na ọrụ ebere niile nke ọ rụrụ ka edere nʼakwụkwọ ọhụ onye amụma bụ Aịzaya, nwa Emọz, dịkwa nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda na Izrel niile.
33Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ, e lie ya nʼugwu nʼebe ili ndị nna nna Devid dị. Ndị Juda niile na ndị niile bi na Jerusalem kwanyere ya ugwu nʼọnwụ ya. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.