7“Dịrịnụ ike, unu adakwala mba. Unu atụla ụjọ maọbụ daa mba nʼihi eze Asịrịa na usuu ndị agha ya, nʼihi na onye dịnyeere anyị ka ya ike.
8Ihe nọnyere ya bụ ogwe aka nke anụ ahụ, ma nke nọnyere anyị bụ Onyenwe anyị, Chineke anyị, inyere anyị aka na ibu agha anyị niile.” Okwu a, nke Hezekaya bụ eze Juda kwuru, mere ka ndị Juda nwee agbamume.
9Mgbe e mesiri, mgbe Senakerib eze Asịrịa na ndị agha ya niile nọchibidoro Lakish, o zipụrụ ndị ọrụ ya gaa Jerusalem, ka ha jiri ozi a gaa maka Hezekaya, bụ eze Juda na ndị Juda niile ndị nọ nʼebe ahụ:
10“Nke a bụ ihe Senakerib, bụ eze Asịrịa sịrị: Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere, mere i ji nọgidesie ike na Jerusalem nʼọnọdụ nnọchibido a?
11Mgbe Hezekaya na-asị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke anyị ga-azọpụta anyị site nʼaka eze Asịrịa,’ ọ bụ aghụghọ ka ọ na-aghọ unu. Ọ na-eduhie unu, na-achọ ka unu nwụọ nʼagụụ nakwa akpịrị ịkpọ nkụ.