22O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Manase mere. Amọn kpọrọ isiala, chụọkwa aja nye arụsị niile, nke Manase mere.
23Ma o wedaghị onwe ya ala nʼihu Onyenwe anyị dịka Manase nna ya mere. Kama Amọn gara nʼihu mee ka ikpe ọmụma ya mụbaa.
24Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu ya nʼime ụlọeze ya.
25Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere Josaya nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya.