2 Ihe E Mere 35

Ndị ikwu Asaf ndị a, bụ ndị na-abụ abụ, nọkwa nʼọnọdụ ha nʼusoro dịka ihe Devid, na Asaf, na Heman, na Jedutun onye amụma eze nyere nʼiwu. Ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama ahapụghị ọnọdụ ha, nʼihi na ndị Livayị ibe ha doziri ihe debere ha.

2 Chronicles 35:15 (UKJV) And the singers the sons of Asaph were in their place, according to the commandment of David, and Asaph, and Heman, and Jeduthun the king's seer; and the porters waited at every gate; they might not depart from their service; for their brethren the Levites prepared for them.

13Otu a kwa, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, ha hụrụ anụ aja ngabiga ahụ nʼọkụ, sie aja ndị dị nsọ nʼite, buputa ha ngwangwa kee ha ndị mmadụ niile.

14Emesịa, ha kwadooro onwe ha ihe, ma kwadokwara ndị nchụaja, nʼihi na ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn, nọọrị na-achụ aja nsure ọkụ na abụba anụ ruo abalị. Ya mere, ndị Livayị ji kwadoro onwe ha ma kwadokwara ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn ihe.

15Ndị ikwu Asaf ndị a, bụ ndị na-abụ abụ, nọkwa nʼọnọdụ ha nʼusoro dịka ihe Devid, na Asaf, na Heman, na Jedutun onye amụma eze nyere nʼiwu. Ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama ahapụghị ọnọdụ ha, nʼihi na ndị Livayị ibe ha doziri ihe debere ha.

16Ya mere, e doziri ofufe niile nke Onyenwe anyị nʼotu ụbọchị ahụ, maka ime Mmemme Ngabiga na ịchụ aja nsure ọkụ niile nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, dịka eze Josaya nyere nʼiwu.

17Ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ mere Mmemme Ngabiga nʼoge ahụ, meekwa mmemme achịcha ekoghị eko ụbọchị asaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.