21Ala ahụ nwere ụbọchị izuike niile kwesiri ya nʼebe o zuruoke, nʼoge niile nke ịtọgbọ nʼefu ya, o zuru ike, ruo mgbe iri afọ asaa ahụ zuru, nʼimezu okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma.
22Ma nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị,
23“Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru: “ ‘Onyenwe anyị, Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa. O nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga, ka Onyenwe anyị Chineke ha nọnyekwara ha.’ ”