2 Ihe E Mere 4

Huram kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ dị nʼụlọnsọ Chineke, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ.

2 Chronicles 4:11 (UKJV) And Huram made the pots, and the shovels, and the basons. And Huram finished the work that he was to make for king Solomon for the house of God;

9Ọ mere ogige ndị nchụaja, mekwa otu ogige ukwuu, na ibo ọnụ ụzọ maka itinye nʼogige ahụ. O jiri bronz machie ibo ọnụ ụzọ ndị ahụ.

10Oke osimiri ahụ ka ọ dọbara nʼakụkụ ndịda, na ncherita ihu ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ahụ.

11Huram kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ dị nʼụlọnsọ Chineke, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ.

12Ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ abụọ dịka efere dị nʼelu ogidi abụọ ahụ; Ihe ọkpụkpụ yiri ụdọ a tụrụ atụ nke e ji chọọ ihe ọkpụkpụ abụọ ahụ dịka efere mma;

13narị anọ nke mkpụrụ pomegranet a kpụrụ akpụ maka ahịrị ihe abụọ ahụ a kpụrụ akpụ, ya bụ, ahịrị pomegranet abụọ nʼihi otu ihe ọkpụkpụ, iji chọọ ihe ọkpụkpụ ahụ yiri efere dị nʼisi elu ogidi ahụ mma;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.