7Ọ kpụrụ ihe ịdọba oriọna ọlaedo iri nʼusoro dịka Chineke nyere ya nʼiwu. O debere ha nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, ise nʼakụkụ ndịda ụlọ ahụ, ise nʼakụkụ nke ugwu.
8O mekwara tebul iri dọnye nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ise nʼakụkụ ndịda, ise nʼakụkụ ugwu. Ọ kpụkwara otu narị efere ọlaedo maka ịkwọsa mmiri.
9Ọ mere ogige ndị nchụaja, mekwa otu ogige ukwuu, na ibo ọnụ ụzọ maka itinye nʼogige ahụ. O jiri bronz machie ibo ọnụ ụzọ ndị ahụ.
10Oke osimiri ahụ ka ọ dọbara nʼakụkụ ndịda, na ncherita ihu ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ahụ.
11Huram kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ dị nʼụlọnsọ Chineke, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ.