17Ọ bụ nʼala ụrọ, nʼobosara ala Jọdan, nʼetiti Sukọt na Zaretan, ka eze mere ka a nọrọ kpụọ ihe ndị a.
18Ihe ndị a niile nke Solomọn mere dị ukwuu nke ukwu; nke bụ na-enweghị ike ịgụkọta ihe ịdị arọ nke bronz ahụ bụ.
19Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Chineke, ya bụ, ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, na tebul niile nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị,
20ihe ịdọkwasị oriọna niile nke ọlaedo a nụchara anụcha, ha na oriọna ha niile, ka ọ na-enwu nʼihu ime ime ebe nsọ, dịka e nyere nʼiwu,
21ihe ịchọ mma oyiyi okoko osisi, na oriọna niile na ihe ịgụta ihe niile. E ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ha niile.