2 Ihe E Mere 6

“Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna Devid, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.

2 Chronicles 6:10 (UKJV) The LORD therefore has performed his word that he has spoken: for I am risen up in the room of David my father, and am set on the throne of Israel, as the LORD promised, and have built the house for the name of the LORD God of Israel.

8Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi, iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.

9Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ya, kama nwa gị nwoke nke si nʼahụ gị pụta ga-ewu ụlọnsọ ahụ nye Aha m.’

10“Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna Devid, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.

11Nʼebe ahụ ka m dọbara igbe ọgbụgba ndụ, nʼime ya ka ọgbụgba Onyenwe anyị dị, bụ nke ya na ụmụ Izrel gbara.”

12Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.