2 Ihe E Mere 6

Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi, iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.

2 Chronicles 6:8 (UKJV) But the LORD said to David my father, Forasmuch as it was in yours heart to build an house for my name, you did well in that it was in yours heart:

6Ma ugbu a, a họrọla m Jerusalem ka ọ bụrụ ebe Aha m ga-adị, ahọrọkwala m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’

7“Nna m, Devid bu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.

8Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi, iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.

9Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ya, kama nwa gị nwoke nke si nʼahụ gị pụta ga-ewu ụlọnsọ ahụ nye Aha m.’

10“Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna Devid, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.