2 Ihe E Mere 6

Ma ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi!”

2 Chronicles 6:2 (UKJV) But I have built an house of habitation for you, and a place for your dwelling for ever.

1Mgbe ahụ, Solomọn sịrị, “Onyenwe anyị ekwuola na ọ ga-ebi nʼoke igwe ojii.

2Ma ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi!”

3Dịka ọgbakọ Izrel niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha.

4Mgbe ahụ ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye ji aka ya abụọ mezuo nkwa ahụ o ji ọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.