2 Ihe E Mere 6

mgbe ahụ, site nʼeluigwe nụrụ ekpere na arịrịọ amara ha, mezukwa ihe ha na-arịọ.

2 Chronicles 6:35 (UKJV) Then hear you from the heavens their prayer and their supplication, and maintain their cause.

33mgbe ahụ, site nʼeluigwe ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Mekwaa ihe niile nke onye mba ọzọ ahụ na-arịọ nʼekpere, ka ndị niile nke ụwa mara aha gị, tụọkwa egwu gị, dịka ndị nke gị bụ Izrel na-eme. Ka ha matakwa na-akpọkwasịrị Aha gị nʼụlọ a nke m wuru.

34“Mgbe ndị gị ga-aga ibu agha megide ndị iro ha, nʼebe ọbụla ị na-eziga ha, mgbe ha chere ihu ha nʼụzọ obodo a nke ị họpụtara na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị, kpee ekpere,

35mgbe ahụ, site nʼeluigwe nụrụ ekpere na arịrịọ amara ha, mezukwa ihe ha na-arịọ.

36“Mgbe ha mehiere megide gị, nʼihi na ọ dịghị mmadụ ọbụla na-adịghị emehie, ị wee iwe megide ha, rara ha nyefee nʼaka ndị iro, ndị ga-adọkpụrụ ha nʼagha gaa nʼobodo ọzọ, maọbụ obodo dị anya maọbụ nke dị nso;

37ọ bụrụ na ha anọrọ nʼala ahụ a dọkpụrụ ha gaa, chegharịa nʼobi ha, nọrọ nʼala ebe a dọtara ha nʼagha, rịọọ gị, sị, ‘Anyị emehiela, anyị emeela ihe nʼadịghị mma, meekwa ajọ omume.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.