32“Ma banyere onye mba ọzọ, onye na-esonyeghị na ndị gị Izrel, kama o si nʼala ebe dị anya bịa nʼihi ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a,
33mgbe ahụ, site nʼeluigwe ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Mekwaa ihe niile nke onye mba ọzọ ahụ na-arịọ nʼekpere, ka ndị niile nke ụwa mara aha gị, tụọkwa egwu gị, dịka ndị nke gị bụ Izrel na-eme. Ka ha matakwa na-akpọkwasịrị Aha gị nʼụlọ a nke m wuru.
34“Mgbe ndị gị ga-aga ibu agha megide ndị iro ha, nʼebe ọbụla ị na-eziga ha, mgbe ha chere ihu ha nʼụzọ obodo a nke ị họpụtara na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị, kpee ekpere,
35mgbe ahụ, site nʼeluigwe nụrụ ekpere na arịrịọ amara ha, mezukwa ihe ha na-arịọ.
36“Mgbe ha mehiere megide gị, nʼihi na ọ dịghị mmadụ ọbụla na-adịghị emehie, ị wee iwe megide ha, rara ha nyefee nʼaka ndị iro, ndị ga-adọkpụrụ ha nʼagha gaa nʼobodo ọzọ, maọbụ obodo dị anya maọbụ nke dị nso;