2 Ihe E Mere 6

“Ma banyere onye mba ọzọ, onye na-esonyeghị na ndị gị Izrel, kama o si nʼala ebe dị anya bịa nʼihi ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a,

2 Chronicles 6:32 (UKJV) Moreover concerning the stranger, which is not of your people Israel, but has come from a far country for your great name's sake, and your mighty hand, and your stretched out arm; if they come and pray in this house;

30mgbe ahụ, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Gbaghara ma meekwa; mesoo onye ọbụla dịka ihe niile ha na-eme si dị, ebe ọ bụ na ị maara obi ha niile (nʼihi na naanị gị maara obi ụmụ mmadụ),

31ka ha tụọ egwu gị, jeekwa ije nʼirubere gị isi nʼoge niile ha na-ebi nʼala ahụ nke i nyere nna nna anyị ha.

32“Ma banyere onye mba ọzọ, onye na-esonyeghị na ndị gị Izrel, kama o si nʼala ebe dị anya bịa nʼihi ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a,

33mgbe ahụ, site nʼeluigwe ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Mekwaa ihe niile nke onye mba ọzọ ahụ na-arịọ nʼekpere, ka ndị niile nke ụwa mara aha gị, tụọkwa egwu gị, dịka ndị nke gị bụ Izrel na-eme. Ka ha matakwa na-akpọkwasịrị Aha gị nʼụlọ a nke m wuru.

34“Mgbe ndị gị ga-aga ibu agha megide ndị iro ha, nʼebe ọbụla ị na-eziga ha, mgbe ha chere ihu ha nʼụzọ obodo a nke ị họpụtara na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị, kpee ekpere,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.