2 Ihe E Mere 7

Ya mere, nʼụbọchị nke iri abụọ na atọ nʼọnwa nke asaa, o zilagara ndị ahụ niile nʼụlọ ha, nʼịṅụrị ọṅụ na obi ụtọ nʼihi ihe ọma niile nke Onyenwe anyị Devid na Solomọn na ndị ya Izrel.

2 Chronicles 7:10 (UKJV) And on the three and twentieth day of the seventh month he sent the people away into their tents, glad and merry in heart for the goodness that the LORD had showed unto David, and to Solomon, and to Israel his people.

8Ya mere, Solomọn mere mmemme a nʼoge ahụ, ụbọchị asaa, ya na ndị Izrel niile. Ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na Lebo Hamat ruo na mmiri iyi Ijipt.

9Nʼụbọchị nke asatọ, ha nwere ọgbakọ, nʼihi na ha mere mmemme nke ido ebe ịchụ aja nsọ nʼime ụbọchị asaa, meekwa mmemme ahụ abalị asaa ọzọ.

10Ya mere, nʼụbọchị nke iri abụọ na atọ nʼọnwa nke asaa, o zilagara ndị ahụ niile nʼụlọ ha, nʼịṅụrị ọṅụ na obi ụtọ nʼihi ihe ọma niile nke Onyenwe anyị Devid na Solomọn na ndị ya Izrel.

11Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, mezukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nakwa nʼụlọeze nke ya onwe ya.

12Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọhụ abalị sị ya, “Anụla m ekpere gị, ahọrọkwala m ebe a nye onwe m, ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.