2Solomọn wugharịrị obodo ndị ahụ Hiram nyere ya, mee ka ndị Izrel biri nʼime ha.
3Solomọn gara Hamat-Zoba, merie ha.
4O wuru obodo Tadmọ nke dị nʼọzara na ọtụtụ obodo nchịkọba ihe na Hamat.
5O wugharịkwara obodo Bet-Horon nke dị nʼelu elu, wuokwa Ndịda Bet-Horon ka ọ ghọọ obodo e wusiri ike nke nwere mgbidi, ibo ọnụ ụzọ ama na mkpọrọ e ji kpọchie ha.
6O wukwara obodo Baalat na obodo niile nke ebe ịchịkọba ihe, na obodo niile ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị.