1Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị na ụlọeze nke ya onwe ya,
2Solomọn wugharịrị obodo ndị ahụ Hiram nyere ya, mee ka ndị Izrel biri nʼime ha.
3Solomọn gara Hamat-Zoba, merie ha.
4O wuru obodo Tadmọ nke dị nʼọzara na ọtụtụ obodo nchịkọba ihe na Hamat.
5O wugharịkwara obodo Bet-Horon nke dị nʼelu elu, wuokwa Ndịda Bet-Horon ka ọ ghọọ obodo e wusiri ike nke nwere mgbidi, ibo ọnụ ụzọ ama na mkpọrọ e ji kpọchie ha.