17E nwere m obi abụọ mgbe m chọrọ ime nke a? Ana m ezube nzube m dịka mmadụ nkịtị, onye dị nkwadobe ikwu “E,” na “E e,” nʼotu oge ahụ?
18Ma dịka Chineke si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi, okwu anyị gwara unu abụghị “E,” na “E e.”
19Nʼihi na Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼọnụ Saịlas na Timoti na mụ onwe m kwusaa abụghị “E” na “E e,” kama nʼime ya ọ bụ naanị “E.”
20Nʼime Kraịst ka anyị hụrụ “E” na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee “Amen” nʼinye Chineke otuto.
21Ọ bụ Chineke nʼonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nʼime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e tere mmanụ.