18Ma dịka Chineke si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi, okwu anyị gwara unu abụghị “E,” na “E e.”
19Nʼihi na Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼọnụ Saịlas na Timoti na mụ onwe m kwusaa abụghị “E” na “E e,” kama nʼime ya ọ bụ naanị “E.”
20Nʼime Kraịst ka anyị hụrụ “E” na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee “Amen” nʼinye Chineke otuto.
21Ọ bụ Chineke nʼonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nʼime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e tere mmanụ.
22Ọ kara anyị akara nʼihu, nyekwa anyị Mmụọ Nsọ ya ka o biri nʼobi anyị, dịka onye ga-ahụ na anyị ga-emezu nkwa ahụ niile.