20Nʼime Kraịst ka anyị hụrụ “E” na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee “Amen” nʼinye Chineke otuto.
21Ọ bụ Chineke nʼonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nʼime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e tere mmanụ.
22Ọ kara anyị akara nʼihu, nyekwa anyị Mmụọ Nsọ ya ka o biri nʼobi anyị, dịka onye ga-ahụ na anyị ga-emezu nkwa ahụ niile.
23Ana m akpọku Chineke dịka onye akaebe m, ọ bụ nʼihi ịnapụta unu mere m ji hapụ ịbịa Kọrint.
24Ọ bụghị na anyị bụ ndị ọchịchị nke okwukwe unu, kama anyị so unu na-arụkọ ọrụ ka unu nwe ọṅụ nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka unu ga-esi kwụrụ chịm.