2 Ndị Kọrint 1

Olileanya anyị nwere nʼebe unu nọ sịrị ike, ebe anyị maara na dịka unu si eketa oke nʼịta ahụhụ anyị, otu ahụkwa ka unu ga-esi keta oke na nkasiobi ahụ anyị na-anata.

2 Corinthians 1:7 (UKJV) And our hope of you is steadfast, knowing, that as all of you are partakers of the sufferings, so shall all of you be also of the consolation.

5Nʼihi na dịka anyị si eketa oke nʼime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a nkasiobi anyị na-ababiga ụba site na Kraịst.

6Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nʼihi na nkasiobi unu, nakwa nzọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, ọ bụkwa nʼihi nkasiobi unu, nke na-arụpụta ike na ume iji ntachiobi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa.

7Olileanya anyị nwere nʼebe unu nọ sịrị ike, ebe anyị maara na dịka unu si eketa oke nʼịta ahụhụ anyị, otu ahụkwa ka unu ga-esi keta oke na nkasiobi ahụ anyị na-anata.

8Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nʼEshịa. Nʼezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesi dịrị ndụ.

9Nʼezie, ọ dị nnọọ nʼoge ahụ, dịka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesighị ka anyị tụkwasị obi nʼike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nʼime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.