7Unu na-ele anya nʼihe ndị dị unu nʼihu. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe doro anya nye onye ọbụla na ha bụ nke Kraịst, ha matakwa na onwe ha, na otu ahụ ha bụ nke Kraịst na anyị onwe anyị bụkwa nke ya.
8Ugbu a, ọ bụrụ na m anya isi banyere ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nʼebe unu nọ, ike ahụ o nyere m iji wulie unu elu, ọ bụghị iji wedaa unu ala, ihere agaghị eme m nʼihi nke a.
9Achọghị ka ọ dịka m a ga-asị na m sitere nʼakwụkwọ ozi m na-emenye unu egwu.
10Nʼihi na ha na-asị, “Akwụkwọ ozi ya dị arọ dịkwa ike, ma na mmadụ, ma nʼọdịdị ya na mmadụ adịghị ike, okwu ọnụ ya bụkwa ihe na-abaghị uru.”
11Ma ana m eme ka ndị dị otu a ghọta na ihe anyị na-ekwu site nʼakwụkwọ ozi mgbe anyị na-anọghị nʼetiti unu, ka anyị ga-eme ma anyị nọrọ nʼetiti unu.