2 Ndị Kọrint 11

Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na unu ga-anagide m ka m kwuo okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Biko nagidenụ m.

2 Corinthians 11:1 (UKJV) Would to God all of you could bear with me a little in my folly: and indeed bear with me.

1Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na unu ga-anagide m ka m kwuo okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Biko nagidenụ m.

2Ekworo m nwere nʼebe unu nọ bụ ekworo nke Chineke. Ekwere m nkwa iwere unu nye otu di, ya bụ Kraịst, ka m nwe ike chee unu nʼihu ya dịka nwaagbọghọ dị ọcha nke na-amaghị nwoke.

3Ma ana m atụ egwu, na dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie unu, mee ka unu kwụsị iji obi dị ọcha na uche ziri ezi jeere Kraịst ozi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.