2 Ndị Kọrint 11

Dịka m kwuru na mbụ, ka onye ọbụla ghara iche na m bụ onye na-enweghị uche. Ọ bụrụkwarị na unu na-eche ụdị echiche a, biko naranụ m dịka onye na-enweghị uche, ka m nwee ike ịnya isi nke nta dịka ndị ọzọ si eme.

2 Corinthians 11:16 (UKJV) I say again, Let no man think me a fool; if otherwise, yet as a fool receive me, that I may boast myself a little.

14Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.

15Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị.

16Dịka m kwuru na mbụ, ka onye ọbụla ghara iche na m bụ onye na-enweghị uche. Ọ bụrụkwarị na unu na-eche ụdị echiche a, biko naranụ m dịka onye na-enweghị uche, ka m nwee ike ịnya isi nke nta dịka ndị ọzọ si eme.

17Ma nʼihe m dabeere na-anya isi, adịghị m ekwu okwu dịka Onyenwe anyị ga-ekwu, maọbụ dịka onye na-enweghị uche.

18Ebe ọtụtụ mmadụ na-anya isi banyere ihe ha bụ nʼụzọ ụwa si eme. Mụ onwe m ga-anyakwa isi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.