2 Ndị Kọrint 11

Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.

2 Corinthians 11:14 (UKJV) And no marvel; for Satan himself is transformed into an angel of light.

12Ma aga m aga nʼihu na-arụ ọrụ m na-achọghị ka unu nyere m aka nʼụzọ ọbụla ka m si otu a mee ka ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị ozi ghara ịnya isi kwuokwa na ha na-arụ ọrụ dịka anyị si arụ ọrụ anyị nʼetiti unu.

13Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst.

14Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.

15Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị.

16Dịka m kwuru na mbụ, ka onye ọbụla ghara iche na m bụ onye na-enweghị uche. Ọ bụrụkwarị na unu na-eche ụdị echiche a, biko naranụ m dịka onye na-enweghị uche, ka m nwee ike ịnya isi nke nta dịka ndị ọzọ si eme.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.