2 Ndị Kọrint 11

Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst.

2 Corinthians 11:13 (UKJV) For such are false apostles, deceitful workers, transforming themselves into the apostles of Christ.

11Nʼihi gịnị? Ọ bụ nʼihi na m ahụghị unu nʼanya? Chineke maara na m hụrụ unu nʼanya.

12Ma aga m aga nʼihu na-arụ ọrụ m na-achọghị ka unu nyere m aka nʼụzọ ọbụla ka m si otu a mee ka ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị ozi ghara ịnya isi kwuokwa na ha na-arụ ọrụ dịka anyị si arụ ọrụ anyị nʼetiti unu.

13Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst.

14Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.

15Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.