10Ebe eziokwu nke Kraịst dị nʼime m, ịnya isi m nke a agaghị akwụsị na mpaghara Akaịa niile.
11Nʼihi gịnị? Ọ bụ nʼihi na m ahụghị unu nʼanya? Chineke maara na m hụrụ unu nʼanya.
12Ma aga m aga nʼihu na-arụ ọrụ m na-achọghị ka unu nyere m aka nʼụzọ ọbụla ka m si otu a mee ka ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị ozi ghara ịnya isi kwuokwa na ha na-arụ ọrụ dịka anyị si arụ ọrụ anyị nʼetiti unu.
13Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst.
14Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.