2 Ndị Kọrint 11

Nʼihi gịnị? Ọ bụ nʼihi na m ahụghị unu nʼanya? Chineke maara na m hụrụ unu nʼanya.

2 Corinthians 11:11 (UKJV) Wherefore? because I love you not? God knows.

9Ma mgbe m nọ nʼetiti unu abụghị m ibu arọ nye onye ọbụla nʼoge mkpa m. Nʼihi na ụmụnna si Masidonia wetaara m ihe niile na-akpa m mkpa. Ebe ọ bụ na m gbalịrị debe onwe m, ka m ghara ịbụ ibu arọ nye unu nʼụzọ ọbụla nʼoge gara aga, agaghị m abụkwa ibu arọ nye unu nʼoge dị nʼihu.

10Ebe eziokwu nke Kraịst dị nʼime m, ịnya isi m nke a agaghị akwụsị na mpaghara Akaịa niile.

11Nʼihi gịnị? Ọ bụ nʼihi na m ahụghị unu nʼanya? Chineke maara na m hụrụ unu nʼanya.

12Ma aga m aga nʼihu na-arụ ọrụ m na-achọghị ka unu nyere m aka nʼụzọ ọbụla ka m si otu a mee ka ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị ozi ghara ịnya isi kwuokwa na ha na-arụ ọrụ dịka anyị si arụ ọrụ anyị nʼetiti unu.

13Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.